Native Bible

Isaiah 5:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nye ndị ahụ na-asị “Ka Chineke mee ngwa; ya rụọ ọrụ ya ọsịịsọ, ka anyị hụ ya. Atụmatụ nke Onye nsọ nke Izrel, ka ọ bịaruo nso, ka ọ pụta ìhè, ka anyị nwe ike mara ihe o zubere.*”

Isaiah 5:19 in English

Isaiah 5:19 · Berean Standard Bible

to those who say, “Let Him hurry and hasten His work so that we may see it! Let the plan of the Holy One of Israel come so that we may know it!”

Context

17Mgbe ahụ, ụmụ atụrụ ga-akpa nri ha dị ka ọ bụ nʼọzara ka ha nọ, ehi na anụ ụlọ ga-akpa nri ha nʼụlọ ndị ọgaranya niile e tikpọrọ etikpọ. 18Ahụhụ ga-adịrị ndị ji aghụghọ na-adọkpụgharị mmehie ha; ahụhụ dịkwara ndị na-adọkpụgharị ajọ omume ha dịka ụdọ eji adọkpụgharị ụgbọala. 19Nye ndị ahụ na-asị “Ka Chineke mee ngwa; ya rụọ ọrụ ya ọsịịsọ, ka anyị hụ ya. Atụmatụ nke Onye nsọ nke Izrel, ka ọ bịaruo nso, ka ọ pụta ìhè, ka anyị nwe ike mara ihe o zubere.*” 20Ahụhụ dịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ, ndị na-etinye ọchịchịrị nʼọnọdụ ìhè na ìhè nʼọnọdụ ọchịchịrị ndị na-etinye ihe dị ilu nʼọnọdụ ihe ụtọ, na ihe ụtọ nʼọnọdụ ihe ilu. 21Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe nʼanya nke onwe ha, ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nwere nghọta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.