Aịzaya 5:21
Isaiah 5:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe nʼanya nke onwe ha, ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nwere nghọta.
Isaiah 5:21 in English
Isaiah 5:21 · Berean Standard Bible
Woe to those who are wise in their own eyes and clever in their own sight.
Context
19Nye ndị ahụ na-asị “Ka Chineke mee ngwa;
ya rụọ ọrụ ya ọsịịsọ,
ka anyị hụ ya.
Atụmatụ nke Onye nsọ nke Izrel,
ka ọ bịaruo nso, ka ọ pụta ìhè,
ka anyị nwe ike mara ihe o zubere.*” 20Ahụhụ dịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe
ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ,
ndị na-etinye ọchịchịrị nʼọnọdụ ìhè
na ìhè nʼọnọdụ ọchịchịrị
ndị na-etinye ihe dị ilu nʼọnọdụ ihe ụtọ,
na ihe ụtọ nʼọnọdụ ihe ilu. 21Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe nʼanya nke onwe ha,
ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nwere nghọta. 22Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya,
na ndị bụkwa dimkpa nʼịgwakọta mmanya, 23ndị na-asị onye ikpe maara nʼikpe amaghị ya nʼihi ịnata ngarị,*
ma wezuga ikpe ziri ezi site nʼebe onye aka ya dị ọcha nọ.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.