Aịzaya 5:22
Isaiah 5:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya, na ndị bụkwa dimkpa nʼịgwakọta mmanya,
Isaiah 5:22 in English
Isaiah 5:22 · Berean Standard Bible
Woe to those who are heroes in drinking wine and champions in mixing beer,
Context
20Ahụhụ dịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe
ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ,
ndị na-etinye ọchịchịrị nʼọnọdụ ìhè
na ìhè nʼọnọdụ ọchịchịrị
ndị na-etinye ihe dị ilu nʼọnọdụ ihe ụtọ,
na ihe ụtọ nʼọnọdụ ihe ilu. 21Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe nʼanya nke onwe ha,
ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nwere nghọta. 22Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya,
na ndị bụkwa dimkpa nʼịgwakọta mmanya, 23ndị na-asị onye ikpe maara nʼikpe amaghị ya nʼihi ịnata ngarị,*
ma wezuga ikpe ziri ezi site nʼebe onye aka ya dị ọcha nọ.* 24Nʼihi ya, dịka ire ọkụ si erechapụ ahịhịa ọka,
na dịka ahịhịa kpọrọ nkụ si ada nʼime ọkụ na-enwu enwu,
otu a ka mgbọrọgwụ ha ga-ere ure
okoko ha ka ikuku ga-ebufu dịka uzuzu;
nʼihi na ha ajụla iwu niile Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nyere,
lelịakwa okwu nke Onye nsọ Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.