Native Bible

Isaiah 49:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A ga-anara dike nʼagha ihe ọ lụtara nʼagha, maọbụ zọpụta ndị a dọọrọ nʼagha site nʼaka onye afọ tara mmiri*?

Isaiah 49:24 in English

Isaiah 49:24 · Berean Standard Bible

Can the plunder be snatched from the mighty, or the captives of a tyrant * be delivered?

Context

22Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Lee, aga m akpọku ndị mba ọzọ, weliere ha ọkọlọtọ m, ha ga-ekulatara gị ụmụ gị ndị ikom nʼaka ha. Ụmụ ndị inyom ka ha ga-ekukwasị nʼubu ha kulatakwa ha. 23Ndị eze ga-abụkwa ndị nna na-azụ ụmụ gị, ndị eze nwanyị ha ga-abụkwa ndị inyom na-enye ụmụ gị ara. Ha ga-akpọ isiala nye gị, rachakwaa aja dị nʼụkwụ gị abụọ. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, matakwa na ihere agaghị eme ndị niile na-ele anya inyeaka m.” 24A ga-anara dike nʼagha ihe ọ lụtara nʼagha, maọbụ zọpụta ndị a dọọrọ nʼagha site nʼaka onye afọ tara mmiri*? 25Ma otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼezie, a ga-esi nʼaka ndị bụ dike nʼagha pụnara ha ndị ha dọtara nʼagha. A ga-esitekwa nʼaka onye na-akpa ike napụta ya ihe ọ dọtara nʼagha. Nʼihi na aga m ebuso ha agha bụ ndị niile na-ebuso gị agha. Aga m anapụtakwa ụmụ gị. 26Aga m eme ka ndị na-akpagbu gị rie anụ ahụ onwe ha; ha ga-aṅụ ọbara onwe ha ṅụbiga ya oke, dịka mmanya. Mgbe ahụ, ihe niile bụ mmadụ nʼụwa ga-amata, na mụ onwe m Onyenwe anyị, bụ Onye na-azọpụta gị, Onye mgbapụta gị, na Onye dị ike nke Jekọb.” 49:3 Maọbụ, ịdị ukwuu 49:9 Maọbụ, ndị a dọtara nʼagha 49:12 Nʼime akwụkwọ ndị mgbe ochie, aha ị ga-ahụ bụ Sinim. 49:20 Ndị a nọ na mba ọzọ mụọ ga-alọta 49:24 Ndị onye ezi omume dọtara nʼagha, a ga-eme ka ha wezuga onwe ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.