Aịzaya 49:23
Isaiah 49:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị eze ga-abụkwa ndị nna na-azụ ụmụ gị, ndị eze nwanyị ha ga-abụkwa ndị inyom na-enye ụmụ gị ara. Ha ga-akpọ isiala nye gị, rachakwaa aja dị nʼụkwụ gị abụọ. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, matakwa na ihere agaghị eme ndị niile na-ele anya inyeaka m.”
Isaiah 49:23 in English
Isaiah 49:23 · Berean Standard Bible
Kings will be your foster fathers, and their queens your nursing mothers. They will bow to you facedown and lick the dust at your feet. Then you will know that I am the LORD; those who hope in Me will never be put to shame.”
Context
21Mgbe ahụ, ị ga-eche nʼime onwe gị sị,
‘Onye mụtaara m ọtụtụ ụmụ ndị a niile?
A dịrị m ka nwanyị na-amụghị nwa maọbụ onye ụmụ ya nwụchara.
Onye ajụrụ ajụ na nke e mere ka ọ gaa biri nʼala ọzọ.
Mụ onwe m fọdụrụ, naanị m.
Onye kwa mụụrụ m ụmụ ndị a?
Onye zụlitere ha?’ ” 22Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“Lee, aga m akpọku ndị mba ọzọ,
weliere ha ọkọlọtọ m,
ha ga-ekulatara gị ụmụ gị ndị ikom nʼaka ha.
Ụmụ ndị inyom ka ha ga-ekukwasị nʼubu ha kulatakwa ha. 23Ndị eze ga-abụkwa ndị nna na-azụ ụmụ gị,
ndị eze nwanyị ha ga-abụkwa ndị inyom na-enye ụmụ gị ara.
Ha ga-akpọ isiala nye gị,
rachakwaa aja dị nʼụkwụ gị abụọ.
Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,
matakwa na ihere agaghị eme ndị niile na-ele anya inyeaka m.” 24A ga-anara dike nʼagha ihe ọ lụtara nʼagha,
maọbụ zọpụta ndị a dọọrọ nʼagha site nʼaka onye afọ tara mmiri*? 25Ma otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Nʼezie, a ga-esi nʼaka ndị bụ dike nʼagha pụnara ha ndị ha dọtara nʼagha.
A ga-esitekwa nʼaka onye na-akpa ike napụta ya ihe ọ dọtara nʼagha.
Nʼihi na aga m ebuso ha agha bụ ndị niile na-ebuso gị agha.
Aga m anapụtakwa ụmụ gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.