Aịzaya 49:22
Isaiah 49:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Lee, aga m akpọku ndị mba ọzọ, weliere ha ọkọlọtọ m, ha ga-ekulatara gị ụmụ gị ndị ikom nʼaka ha. Ụmụ ndị inyom ka ha ga-ekukwasị nʼubu ha kulatakwa ha.
Isaiah 49:22 in English
Isaiah 49:22 · Berean Standard Bible
This is what the Lord GOD says: “Behold, I will lift up My hand to the nations, and raise My banner to the peoples. They will bring your sons in their arms * and carry your daughters on their shoulders.
Context
20Ụmụ niile a mụrụ nʼoge ọnwụ gbabara gị aka,*
ga-asịkwa na ntị gị,
‘Ebe a dịrị anyị oke ntakịrị,
nye anyị ebe sara mbara karịa nke anyị ga-ebi nʼime ya.’ 21Mgbe ahụ, ị ga-eche nʼime onwe gị sị,
‘Onye mụtaara m ọtụtụ ụmụ ndị a niile?
A dịrị m ka nwanyị na-amụghị nwa maọbụ onye ụmụ ya nwụchara.
Onye ajụrụ ajụ na nke e mere ka ọ gaa biri nʼala ọzọ.
Mụ onwe m fọdụrụ, naanị m.
Onye kwa mụụrụ m ụmụ ndị a?
Onye zụlitere ha?’ ” 22Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“Lee, aga m akpọku ndị mba ọzọ,
weliere ha ọkọlọtọ m,
ha ga-ekulatara gị ụmụ gị ndị ikom nʼaka ha.
Ụmụ ndị inyom ka ha ga-ekukwasị nʼubu ha kulatakwa ha. 23Ndị eze ga-abụkwa ndị nna na-azụ ụmụ gị,
ndị eze nwanyị ha ga-abụkwa ndị inyom na-enye ụmụ gị ara.
Ha ga-akpọ isiala nye gị,
rachakwaa aja dị nʼụkwụ gị abụọ.
Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,
matakwa na ihere agaghị eme ndị niile na-ele anya inyeaka m.” 24A ga-anara dike nʼagha ihe ọ lụtara nʼagha,
maọbụ zọpụta ndị a dọọrọ nʼagha site nʼaka onye afọ tara mmiri*?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.