Aịzaya 49:21
Isaiah 49:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ị ga-eche nʼime onwe gị sị, ‘Onye mụtaara m ọtụtụ ụmụ ndị a niile? A dịrị m ka nwanyị na-amụghị nwa maọbụ onye ụmụ ya nwụchara. Onye ajụrụ ajụ na nke e mere ka ọ gaa biri nʼala ọzọ. Mụ onwe m fọdụrụ, naanị m. Onye kwa mụụrụ m ụmụ ndị a? Onye zụlitere ha?’ ”
Isaiah 49:21 in English
Isaiah 49:21 · Berean Standard Bible
Then you will say in your heart, ‘Who has begotten these for me? I was bereaved and barren; I was exiled and rejected. So who has reared them? Look, I was left all alone, so where did they come from?’”
Context
19“Ọ bụ ezie na e bibiri gị, mee ka ị tọgbọrọ nʼefu,
ala gị abụrụ nkpọnkpọ ebe,
ma ugbu a, ị gaghị ezuru ndị gị,
otu a kwa, ndị ahụ ripịara gị ga-anọ gị nʼebe dị anya. 20Ụmụ niile a mụrụ nʼoge ọnwụ gbabara gị aka,*
ga-asịkwa na ntị gị,
‘Ebe a dịrị anyị oke ntakịrị,
nye anyị ebe sara mbara karịa nke anyị ga-ebi nʼime ya.’ 21Mgbe ahụ, ị ga-eche nʼime onwe gị sị,
‘Onye mụtaara m ọtụtụ ụmụ ndị a niile?
A dịrị m ka nwanyị na-amụghị nwa maọbụ onye ụmụ ya nwụchara.
Onye ajụrụ ajụ na nke e mere ka ọ gaa biri nʼala ọzọ.
Mụ onwe m fọdụrụ, naanị m.
Onye kwa mụụrụ m ụmụ ndị a?
Onye zụlitere ha?’ ” 22Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“Lee, aga m akpọku ndị mba ọzọ,
weliere ha ọkọlọtọ m,
ha ga-ekulatara gị ụmụ gị ndị ikom nʼaka ha.
Ụmụ ndị inyom ka ha ga-ekukwasị nʼubu ha kulatakwa ha. 23Ndị eze ga-abụkwa ndị nna na-azụ ụmụ gị,
ndị eze nwanyị ha ga-abụkwa ndị inyom na-enye ụmụ gị ara.
Ha ga-akpọ isiala nye gị,
rachakwaa aja dị nʼụkwụ gị abụọ.
Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,
matakwa na ihere agaghị eme ndị niile na-ele anya inyeaka m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.