Aịzaya 49:20
Isaiah 49:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ niile a mụrụ nʼoge ọnwụ gbabara gị aka,* ga-asịkwa na ntị gị, ‘Ebe a dịrị anyị oke ntakịrị, nye anyị ebe sara mbara karịa nke anyị ga-ebi nʼime ya.’
Isaiah 49:20 in English
Isaiah 49:20 · Berean Standard Bible
Yet the children of your bereavement will say in your hearing, ‘This place is too small for us; make room for us to live here.’
Context
18Welie anya gị abụọ lee gburugburu, legharịa anya,
ụmụ gị niile na-ezukọta na-alọghachikwute gị.
Dịka m na-adị ndụ,” ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Ị ga-eyi ha niile dịka ọla ịchọ mma,
ị ga-ekekwa ha dịka nwanyị a na-alụ ọhụrụ si eme. 19“Ọ bụ ezie na e bibiri gị, mee ka ị tọgbọrọ nʼefu,
ala gị abụrụ nkpọnkpọ ebe,
ma ugbu a, ị gaghị ezuru ndị gị,
otu a kwa, ndị ahụ ripịara gị ga-anọ gị nʼebe dị anya. 20Ụmụ niile a mụrụ nʼoge ọnwụ gbabara gị aka,*
ga-asịkwa na ntị gị,
‘Ebe a dịrị anyị oke ntakịrị,
nye anyị ebe sara mbara karịa nke anyị ga-ebi nʼime ya.’ 21Mgbe ahụ, ị ga-eche nʼime onwe gị sị,
‘Onye mụtaara m ọtụtụ ụmụ ndị a niile?
A dịrị m ka nwanyị na-amụghị nwa maọbụ onye ụmụ ya nwụchara.
Onye ajụrụ ajụ na nke e mere ka ọ gaa biri nʼala ọzọ.
Mụ onwe m fọdụrụ, naanị m.
Onye kwa mụụrụ m ụmụ ndị a?
Onye zụlitere ha?’ ” 22Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“Lee, aga m akpọku ndị mba ọzọ,
weliere ha ọkọlọtọ m,
ha ga-ekulatara gị ụmụ gị ndị ikom nʼaka ha.
Ụmụ ndị inyom ka ha ga-ekukwasị nʼubu ha kulatakwa ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.