Aịzaya 49:18
Isaiah 49:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Welie anya gị abụọ lee gburugburu, legharịa anya, ụmụ gị niile na-ezukọta na-alọghachikwute gị. Dịka m na-adị ndụ,” ka Onyenwe anyị kwubiri. “Ị ga-eyi ha niile dịka ọla ịchọ mma, ị ga-ekekwa ha dịka nwanyị a na-alụ ọhụrụ si eme.
Isaiah 49:18 in English
Isaiah 49:18 · Berean Standard Bible
Lift up your eyes and look around. They all gather together; they come to you. As surely as I live,” declares the LORD, “you will wear them all as jewelry and put them on like a bride.
Context
16Lee, edeela m aha gị nʼọbụaka m,
nʼihu m kwa ka m debere foto mgbidi gị nke ga-adịgide. 17Ụmụ gị emeela ngwangwa lọghachite,
ndị ahụ mere ka ị tọgbọrọ nʼefu ga-esi nʼime gị pụọ. 18Welie anya gị abụọ lee gburugburu, legharịa anya,
ụmụ gị niile na-ezukọta na-alọghachikwute gị.
Dịka m na-adị ndụ,” ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Ị ga-eyi ha niile dịka ọla ịchọ mma,
ị ga-ekekwa ha dịka nwanyị a na-alụ ọhụrụ si eme. 19“Ọ bụ ezie na e bibiri gị, mee ka ị tọgbọrọ nʼefu,
ala gị abụrụ nkpọnkpọ ebe,
ma ugbu a, ị gaghị ezuru ndị gị,
otu a kwa, ndị ahụ ripịara gị ga-anọ gị nʼebe dị anya. 20Ụmụ niile a mụrụ nʼoge ọnwụ gbabara gị aka,*
ga-asịkwa na ntị gị,
‘Ebe a dịrị anyị oke ntakịrị,
nye anyị ebe sara mbara karịa nke anyị ga-ebi nʼime ya.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.