Aịzaya 49:16
Isaiah 49:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee, edeela m aha gị nʼọbụaka m, nʼihu m kwa ka m debere foto mgbidi gị nke ga-adịgide.
Isaiah 49:16 in English
Isaiah 49:16 · Berean Standard Bible
Behold, I have inscribed you on the palms of My hands; your walls are ever before Me.
Context
14Ma Zayọn sịrị, “Onyenwe anyị agbakụtala m azụ;
Onyenwe m echefuola m.” 15“Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara,
hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya?
Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ,
ma agaghị m echezọ unu. 16Lee, edeela m aha gị nʼọbụaka m,
nʼihu m kwa ka m debere foto mgbidi gị nke ga-adịgide. 17Ụmụ gị emeela ngwangwa lọghachite,
ndị ahụ mere ka ị tọgbọrọ nʼefu ga-esi nʼime gị pụọ. 18Welie anya gị abụọ lee gburugburu, legharịa anya,
ụmụ gị niile na-ezukọta na-alọghachikwute gị.
Dịka m na-adị ndụ,” ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Ị ga-eyi ha niile dịka ọla ịchọ mma,
ị ga-ekekwa ha dịka nwanyị a na-alụ ọhụrụ si eme.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.