Aịzaya 49:14
Isaiah 49:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Zayọn sịrị, “Onyenwe anyị agbakụtala m azụ; Onyenwe m echefuola m.”
Isaiah 49:14 in English
Isaiah 49:14 · Berean Standard Bible
But Zion said, “The LORD has forsaken me; the Lord has forgotten me!”
Context
12Lee, ndị m ga-alọghachi, ha ga-esitekwa nʼebe dị anya,
ụfọdụ ga-esite nʼugwu, ụfọdụ nʼọdịda anyanwụ,
ndị ọzọ ga-esite na mpaghara Aswan.*” 13Tienụ mkpu ọṅụ, eluigwe niile;
ka ụwa ṅụrịa ọṅụ.
Ugwu ukwu niile, bụọnụ abụ,
nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi.
Ọ ga-enwekwa obi ebere nʼihi iru ụjụ ha. 14Ma Zayọn sịrị, “Onyenwe anyị agbakụtala m azụ;
Onyenwe m echefuola m.” 15“Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara,
hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya?
Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ,
ma agaghị m echezọ unu. 16Lee, edeela m aha gị nʼọbụaka m,
nʼihu m kwa ka m debere foto mgbidi gị nke ga-adịgide.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.