Aịzaya 49:13
Isaiah 49:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tienụ mkpu ọṅụ, eluigwe niile; ka ụwa ṅụrịa ọṅụ. Ugwu ukwu niile, bụọnụ abụ, nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi. Ọ ga-enwekwa obi ebere nʼihi iru ụjụ ha.
Isaiah 49:13 in English
Isaiah 49:13 · Berean Standard Bible
Shout for joy, O heavens; rejoice, O earth; break forth in song, O mountains! For the LORD has comforted His people, and He will have compassion on His afflicted ones.
Context
11Aga m emekwa ka ugwu ukwu niile ghọọ okporoụzọ,
meekwa ka okporoụzọ niile guzozie. 12Lee, ndị m ga-alọghachi, ha ga-esitekwa nʼebe dị anya,
ụfọdụ ga-esite nʼugwu, ụfọdụ nʼọdịda anyanwụ,
ndị ọzọ ga-esite na mpaghara Aswan.*” 13Tienụ mkpu ọṅụ, eluigwe niile;
ka ụwa ṅụrịa ọṅụ.
Ugwu ukwu niile, bụọnụ abụ,
nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi.
Ọ ga-enwekwa obi ebere nʼihi iru ụjụ ha. 14Ma Zayọn sịrị, “Onyenwe anyị agbakụtala m azụ;
Onyenwe m echefuola m.” 15“Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara,
hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya?
Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ,
ma agaghị m echezọ unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.