Aịzaya 49:12
Isaiah 49:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee, ndị m ga-alọghachi, ha ga-esitekwa nʼebe dị anya, ụfọdụ ga-esite nʼugwu, ụfọdụ nʼọdịda anyanwụ, ndị ọzọ ga-esite na mpaghara Aswan.*”
Isaiah 49:12 in English
Isaiah 49:12 · Berean Standard Bible
Behold, they will come from far away, from the north and from the west,* and from the land of Aswan.*”
Context
10Agụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ.
Oke anwụ otiti nke ọzara agaghị acha ha ọzọ.
Nʼihi na Onyenwe anyị ga-esite nʼobi ebere ya duo ha
nʼakụkụ isi iyi jupụtara na mmiri. 11Aga m emekwa ka ugwu ukwu niile ghọọ okporoụzọ,
meekwa ka okporoụzọ niile guzozie. 12Lee, ndị m ga-alọghachi, ha ga-esitekwa nʼebe dị anya,
ụfọdụ ga-esite nʼugwu, ụfọdụ nʼọdịda anyanwụ,
ndị ọzọ ga-esite na mpaghara Aswan.*” 13Tienụ mkpu ọṅụ, eluigwe niile;
ka ụwa ṅụrịa ọṅụ.
Ugwu ukwu niile, bụọnụ abụ,
nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi.
Ọ ga-enwekwa obi ebere nʼihi iru ụjụ ha. 14Ma Zayọn sịrị, “Onyenwe anyị agbakụtala m azụ;
Onyenwe m echefuola m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.