Aịzaya 49:10
Isaiah 49:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Agụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ. Oke anwụ otiti nke ọzara agaghị acha ha ọzọ. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-esite nʼobi ebere ya duo ha nʼakụkụ isi iyi jupụtara na mmiri.
Isaiah 49:10 in English
Isaiah 49:10 · Berean Standard Bible
They will not hunger or thirst, nor will scorching heat or sun beat down on them.* For He who has compassion on them will guide them and lead them beside springs of water.
Context
8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu:
“Nʼoge amara m, aga m aza unu,
nʼụbọchị nzọpụta aga m enyere unu aka.
Aga m echebe unu, mee ka unu
bụrụ ọgbụgba ndụ nye ndị mmadụ,
iweghachite ala ahụ
na ikegharịkwa ihe nketa ya nke tọgbọrọ nʼefu; 9na-asị ndị mkpọrọ,* ‘Pụtanụ,’
na-asịkwa ndị nọ nʼọchịchịrị, ‘Pụtanụ nʼihe.’
“Ha ga-adịkwa ka atụrụ m, nọọ nʼakụkụ ụzọ,
ndị na-ata ahịhịa nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ, nʼakụkụ ugwu nta niile. 10Agụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ.
Oke anwụ otiti nke ọzara agaghị acha ha ọzọ.
Nʼihi na Onyenwe anyị ga-esite nʼobi ebere ya duo ha
nʼakụkụ isi iyi jupụtara na mmiri. 11Aga m emekwa ka ugwu ukwu niile ghọọ okporoụzọ,
meekwa ka okporoụzọ niile guzozie. 12Lee, ndị m ga-alọghachi, ha ga-esitekwa nʼebe dị anya,
ụfọdụ ga-esite nʼugwu, ụfọdụ nʼọdịda anyanwụ,
ndị ọzọ ga-esite na mpaghara Aswan.*”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.