Aịzaya 49:9
Isaiah 49:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na-asị ndị mkpọrọ,* ‘Pụtanụ,’ na-asịkwa ndị nọ nʼọchịchịrị, ‘Pụtanụ nʼihe.’ “Ha ga-adịkwa ka atụrụ m, nọọ nʼakụkụ ụzọ, ndị na-ata ahịhịa nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ, nʼakụkụ ugwu nta niile.
Isaiah 49:9 in English
Isaiah 49:9 · Berean Standard Bible
to say to the prisoners, ‘Come out,’ and to those in darkness, ‘Show yourselves.’ They will feed along the pathways, and find pasture on every barren hill.
Context
7Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
Onye mgbapụta na Onye nsọ Izrel
na-agwa onye ahụ a na-elelị anya, onye ahụ mba kpọrọ ihe arụ,
e, onye ahụ ndị na-achị achị mere ka ọ ghọọ ohu ha,
“Ndị eze ga-eguzo ọtọ mgbe ị na-agafe.
Ndịisi na-achị achị ga-akpọ isiala nye gị,
nʼihi na Onyenwe anyị, Onye kwesiri ntụkwasị obi,
Onye nsọ Izrel, ahọpụtala gị.” 8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu:
“Nʼoge amara m, aga m aza unu,
nʼụbọchị nzọpụta aga m enyere unu aka.
Aga m echebe unu, mee ka unu
bụrụ ọgbụgba ndụ nye ndị mmadụ,
iweghachite ala ahụ
na ikegharịkwa ihe nketa ya nke tọgbọrọ nʼefu; 9na-asị ndị mkpọrọ,* ‘Pụtanụ,’
na-asịkwa ndị nọ nʼọchịchịrị, ‘Pụtanụ nʼihe.’
“Ha ga-adịkwa ka atụrụ m, nọọ nʼakụkụ ụzọ,
ndị na-ata ahịhịa nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ, nʼakụkụ ugwu nta niile. 10Agụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ.
Oke anwụ otiti nke ọzara agaghị acha ha ọzọ.
Nʼihi na Onyenwe anyị ga-esite nʼobi ebere ya duo ha
nʼakụkụ isi iyi jupụtara na mmiri. 11Aga m emekwa ka ugwu ukwu niile ghọọ okporoụzọ,
meekwa ka okporoụzọ niile guzozie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.