Aịzaya 49:7
Isaiah 49:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Onye mgbapụta na Onye nsọ Izrel na-agwa onye ahụ a na-elelị anya, onye ahụ mba kpọrọ ihe arụ, e, onye ahụ ndị na-achị achị mere ka ọ ghọọ ohu ha, “Ndị eze ga-eguzo ọtọ mgbe ị na-agafe. Ndịisi na-achị achị ga-akpọ isiala nye gị, nʼihi na Onyenwe anyị, Onye kwesiri ntụkwasị obi, Onye nsọ Izrel, ahọpụtala gị.”
Isaiah 49:7 in English
Isaiah 49:7 · Berean Standard Bible
Thus says the LORD, the Redeemer and Holy One of Israel, to Him who was despised and abhorred by the nation, to the Servant of rulers: “Kings will see You and rise, and princes will bow down, because of the LORD, who is faithful, the Holy One of Israel, who has chosen You.”
Context
5Ma ugbu a Onyenwe anyị na-asị,
Onye ahụ kpụrụ m nʼafọ nne m ka m bụrụ onye na-ejere ya ozi;
ka ọ kpọghachite Jekọb nye ya
ka achịkọtakwa ndị Izrel nyekwa ya onwe ya,
nʼihi na-abụ m onye nsọpụrụ dịrị nʼanya Onyenwe anyị,
Chineke m aghọkwaarala m ike m. 6Ọ sịrị,
“Ọ bụ ihe dị nta karịa, gị ị bụrụ m ohu,
ịkpọghachita ebo niile nke Jekọb
na ịkpọghachita ndị Izrel ndị m chebere.
Aga m emekwa ka ị bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ,
ka nzọpụta m site nʼaka gị ruo ndị bi na nsọtụ ụwa niile.” 7Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
Onye mgbapụta na Onye nsọ Izrel
na-agwa onye ahụ a na-elelị anya, onye ahụ mba kpọrọ ihe arụ,
e, onye ahụ ndị na-achị achị mere ka ọ ghọọ ohu ha,
“Ndị eze ga-eguzo ọtọ mgbe ị na-agafe.
Ndịisi na-achị achị ga-akpọ isiala nye gị,
nʼihi na Onyenwe anyị, Onye kwesiri ntụkwasị obi,
Onye nsọ Izrel, ahọpụtala gị.” 8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu:
“Nʼoge amara m, aga m aza unu,
nʼụbọchị nzọpụta aga m enyere unu aka.
Aga m echebe unu, mee ka unu
bụrụ ọgbụgba ndụ nye ndị mmadụ,
iweghachite ala ahụ
na ikegharịkwa ihe nketa ya nke tọgbọrọ nʼefu; 9na-asị ndị mkpọrọ,* ‘Pụtanụ,’
na-asịkwa ndị nọ nʼọchịchịrị, ‘Pụtanụ nʼihe.’
“Ha ga-adịkwa ka atụrụ m, nọọ nʼakụkụ ụzọ,
ndị na-ata ahịhịa nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ, nʼakụkụ ugwu nta niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.