Aịzaya 49:6
Isaiah 49:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị, “Ọ bụ ihe dị nta karịa, gị ị bụrụ m ohu, ịkpọghachita ebo niile nke Jekọb na ịkpọghachita ndị Izrel ndị m chebere. Aga m emekwa ka ị bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka nzọpụta m site nʼaka gị ruo ndị bi na nsọtụ ụwa niile.”
Isaiah 49:6 in English
Isaiah 49:6 · Berean Standard Bible
He says: “It is not enough for You to be My Servant, to raise up the tribes of Jacob, and to restore the protected ones of Israel. I will also make You a light for the nations, to bring My salvation to the ends of the earth.”*
Context
4Ma mụ onwe m sịrị, “Ọ bụ nʼefu ka m dọgburu onwe m nʼọrụ.
Etufuola m ike m niile nʼihi ihe na-abụghị ihe.
Ma ihe ruru m dị nʼaka Onyenwe anyị,
ụgwọ ọrụ m dịkwa nʼaka Chineke m.” 5Ma ugbu a Onyenwe anyị na-asị,
Onye ahụ kpụrụ m nʼafọ nne m ka m bụrụ onye na-ejere ya ozi;
ka ọ kpọghachite Jekọb nye ya
ka achịkọtakwa ndị Izrel nyekwa ya onwe ya,
nʼihi na-abụ m onye nsọpụrụ dịrị nʼanya Onyenwe anyị,
Chineke m aghọkwaarala m ike m. 6Ọ sịrị,
“Ọ bụ ihe dị nta karịa, gị ị bụrụ m ohu,
ịkpọghachita ebo niile nke Jekọb
na ịkpọghachita ndị Izrel ndị m chebere.
Aga m emekwa ka ị bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ,
ka nzọpụta m site nʼaka gị ruo ndị bi na nsọtụ ụwa niile.” 7Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
Onye mgbapụta na Onye nsọ Izrel
na-agwa onye ahụ a na-elelị anya, onye ahụ mba kpọrọ ihe arụ,
e, onye ahụ ndị na-achị achị mere ka ọ ghọọ ohu ha,
“Ndị eze ga-eguzo ọtọ mgbe ị na-agafe.
Ndịisi na-achị achị ga-akpọ isiala nye gị,
nʼihi na Onyenwe anyị, Onye kwesiri ntụkwasị obi,
Onye nsọ Izrel, ahọpụtala gị.” 8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu:
“Nʼoge amara m, aga m aza unu,
nʼụbọchị nzọpụta aga m enyere unu aka.
Aga m echebe unu, mee ka unu
bụrụ ọgbụgba ndụ nye ndị mmadụ,
iweghachite ala ahụ
na ikegharịkwa ihe nketa ya nke tọgbọrọ nʼefu;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.