Aịzaya 49:4
Isaiah 49:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mụ onwe m sịrị, “Ọ bụ nʼefu ka m dọgburu onwe m nʼọrụ. Etufuola m ike m niile nʼihi ihe na-abụghị ihe. Ma ihe ruru m dị nʼaka Onyenwe anyị, ụgwọ ọrụ m dịkwa nʼaka Chineke m.”
Isaiah 49:4 in English
Isaiah 49:4 · Berean Standard Bible
But I said, “I have labored in vain, I have spent My strength in futility and vanity; yet My vindication is with the LORD, and My reward is with My God.”
Context
2O mere ka okwu sị m nʼọnụ dịrị nkọ dịka mma agha.
O zobere m nʼaka ya kpuchie m.
O mere m ka m dịrị ka àkụ dị nkọ
nke o zoro nʼime akpa àkụ ya. 3Ọ sịrị m, “Ị bụ ohu m, Izrel.
Ọ bụkwa site na gị ka m ga-eji gosi ịma mma* na ike m.” 4Ma mụ onwe m sịrị, “Ọ bụ nʼefu ka m dọgburu onwe m nʼọrụ.
Etufuola m ike m niile nʼihi ihe na-abụghị ihe.
Ma ihe ruru m dị nʼaka Onyenwe anyị,
ụgwọ ọrụ m dịkwa nʼaka Chineke m.” 5Ma ugbu a Onyenwe anyị na-asị,
Onye ahụ kpụrụ m nʼafọ nne m ka m bụrụ onye na-ejere ya ozi;
ka ọ kpọghachite Jekọb nye ya
ka achịkọtakwa ndị Izrel nyekwa ya onwe ya,
nʼihi na-abụ m onye nsọpụrụ dịrị nʼanya Onyenwe anyị,
Chineke m aghọkwaarala m ike m. 6Ọ sịrị,
“Ọ bụ ihe dị nta karịa, gị ị bụrụ m ohu,
ịkpọghachita ebo niile nke Jekọb
na ịkpọghachita ndị Izrel ndị m chebere.
Aga m emekwa ka ị bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ,
ka nzọpụta m site nʼaka gị ruo ndị bi na nsọtụ ụwa niile.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.