Aịzaya 49:2
Isaiah 49:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O mere ka okwu sị m nʼọnụ dịrị nkọ dịka mma agha. O zobere m nʼaka ya kpuchie m. O mere m ka m dịrị ka àkụ dị nkọ nke o zoro nʼime akpa àkụ ya.
Isaiah 49:2 in English
Isaiah 49:2 · Berean Standard Bible
He made My mouth like a sharp sword; He hid Me in the shadow of His hand. He made Me like a polished arrow; He hid Me in His quiver.
Context
1Geenụ m ntị, unu niile ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu,
nụrụkwanụ nke a, unu ndị nọ na mba dị anya.
Onyenwe anyị kpọrọ m tupu amụọ m.
Ọ kpọrọ m aha m mgbe m ka nọ nʼime afọ nne m. 2O mere ka okwu sị m nʼọnụ dịrị nkọ dịka mma agha.
O zobere m nʼaka ya kpuchie m.
O mere m ka m dịrị ka àkụ dị nkọ
nke o zoro nʼime akpa àkụ ya. 3Ọ sịrị m, “Ị bụ ohu m, Izrel.
Ọ bụkwa site na gị ka m ga-eji gosi ịma mma* na ike m.” 4Ma mụ onwe m sịrị, “Ọ bụ nʼefu ka m dọgburu onwe m nʼọrụ.
Etufuola m ike m niile nʼihi ihe na-abụghị ihe.
Ma ihe ruru m dị nʼaka Onyenwe anyị,
ụgwọ ọrụ m dịkwa nʼaka Chineke m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.