Aịzaya 49:1
Isaiah 49:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Geenụ m ntị, unu niile ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu, nụrụkwanụ nke a, unu ndị nọ na mba dị anya. Onyenwe anyị kpọrọ m tupu amụọ m. Ọ kpọrọ m aha m mgbe m ka nọ nʼime afọ nne m.
Isaiah 49:1 in English
Isaiah 49:1 · Berean Standard Bible
Listen to Me, O islands;* pay attention, O distant peoples: The LORD called Me from the womb; from the body of My mother He named Me.
Context
1Geenụ m ntị, unu niile ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu,
nụrụkwanụ nke a, unu ndị nọ na mba dị anya.
Onyenwe anyị kpọrọ m tupu amụọ m.
Ọ kpọrọ m aha m mgbe m ka nọ nʼime afọ nne m. 2O mere ka okwu sị m nʼọnụ dịrị nkọ dịka mma agha.
O zobere m nʼaka ya kpuchie m.
O mere m ka m dịrị ka àkụ dị nkọ
nke o zoro nʼime akpa àkụ ya. 3Ọ sịrị m, “Ị bụ ohu m, Izrel.
Ọ bụkwa site na gị ka m ga-eji gosi ịma mma* na ike m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.