Aịzaya 49:3
Isaiah 49:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị m, “Ị bụ ohu m, Izrel. Ọ bụkwa site na gị ka m ga-eji gosi ịma mma* na ike m.”
Isaiah 49:3 in English
Isaiah 49:3 · Berean Standard Bible
He said to Me, “You are My Servant, Israel, in whom I will display My glory.”
Context
1Geenụ m ntị, unu niile ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu,
nụrụkwanụ nke a, unu ndị nọ na mba dị anya.
Onyenwe anyị kpọrọ m tupu amụọ m.
Ọ kpọrọ m aha m mgbe m ka nọ nʼime afọ nne m. 2O mere ka okwu sị m nʼọnụ dịrị nkọ dịka mma agha.
O zobere m nʼaka ya kpuchie m.
O mere m ka m dịrị ka àkụ dị nkọ
nke o zoro nʼime akpa àkụ ya. 3Ọ sịrị m, “Ị bụ ohu m, Izrel.
Ọ bụkwa site na gị ka m ga-eji gosi ịma mma* na ike m.” 4Ma mụ onwe m sịrị, “Ọ bụ nʼefu ka m dọgburu onwe m nʼọrụ.
Etufuola m ike m niile nʼihi ihe na-abụghị ihe.
Ma ihe ruru m dị nʼaka Onyenwe anyị,
ụgwọ ọrụ m dịkwa nʼaka Chineke m.” 5Ma ugbu a Onyenwe anyị na-asị,
Onye ahụ kpụrụ m nʼafọ nne m ka m bụrụ onye na-ejere ya ozi;
ka ọ kpọghachite Jekọb nye ya
ka achịkọtakwa ndị Izrel nyekwa ya onwe ya,
nʼihi na-abụ m onye nsọpụrụ dịrị nʼanya Onyenwe anyị,
Chineke m aghọkwaarala m ike m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.