Native Bible

Isaiah 49:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara, hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya? Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ, ma agaghị m echezọ unu.

Isaiah 49:15 in English

Isaiah 49:15 · Berean Standard Bible

“Can a woman forget her nursing child, or lack compassion for the son of her womb? Even if she could forget, I will not forget you!

Context

13Tienụ mkpu ọṅụ, eluigwe niile; ka ụwa ṅụrịa ọṅụ. Ugwu ukwu niile, bụọnụ abụ, nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi. Ọ ga-enwekwa obi ebere nʼihi iru ụjụ ha. 14Ma Zayọn sịrị, “Onyenwe anyị agbakụtala m azụ; Onyenwe m echefuola m.” 15“Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara, hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya? Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ, ma agaghị m echezọ unu. 16Lee, edeela m aha gị nʼọbụaka m, nʼihu m kwa ka m debere foto mgbidi gị nke ga-adịgide. 17Ụmụ gị emeela ngwangwa lọghachite, ndị ahụ mere ka ị tọgbọrọ nʼefu ga-esi nʼime gị pụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.