Aịzaya 49:15
Isaiah 49:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara, hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya? Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ, ma agaghị m echezọ unu.
Isaiah 49:15 in English
Isaiah 49:15 · Berean Standard Bible
“Can a woman forget her nursing child, or lack compassion for the son of her womb? Even if she could forget, I will not forget you!
Context
13Tienụ mkpu ọṅụ, eluigwe niile;
ka ụwa ṅụrịa ọṅụ.
Ugwu ukwu niile, bụọnụ abụ,
nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi.
Ọ ga-enwekwa obi ebere nʼihi iru ụjụ ha. 14Ma Zayọn sịrị, “Onyenwe anyị agbakụtala m azụ;
Onyenwe m echefuola m.” 15“Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara,
hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya?
Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ,
ma agaghị m echezọ unu. 16Lee, edeela m aha gị nʼọbụaka m,
nʼihu m kwa ka m debere foto mgbidi gị nke ga-adịgide. 17Ụmụ gị emeela ngwangwa lọghachite,
ndị ahụ mere ka ị tọgbọrọ nʼefu ga-esi nʼime gị pụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.