Aịzaya 49:17
Isaiah 49:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ gị emeela ngwangwa lọghachite, ndị ahụ mere ka ị tọgbọrọ nʼefu ga-esi nʼime gị pụọ.
Isaiah 49:17 in English
Isaiah 49:17 · Berean Standard Bible
Your builders * hasten back; your destroyers and wreckers depart from you.
Context
15“Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara,
hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya?
Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ,
ma agaghị m echezọ unu. 16Lee, edeela m aha gị nʼọbụaka m,
nʼihu m kwa ka m debere foto mgbidi gị nke ga-adịgide. 17Ụmụ gị emeela ngwangwa lọghachite,
ndị ahụ mere ka ị tọgbọrọ nʼefu ga-esi nʼime gị pụọ. 18Welie anya gị abụọ lee gburugburu, legharịa anya,
ụmụ gị niile na-ezukọta na-alọghachikwute gị.
Dịka m na-adị ndụ,” ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Ị ga-eyi ha niile dịka ọla ịchọ mma,
ị ga-ekekwa ha dịka nwanyị a na-alụ ọhụrụ si eme. 19“Ọ bụ ezie na e bibiri gị, mee ka ị tọgbọrọ nʼefu,
ala gị abụrụ nkpọnkpọ ebe,
ma ugbu a, ị gaghị ezuru ndị gị,
otu a kwa, ndị ahụ ripịara gị ga-anọ gị nʼebe dị anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.