Aịzaya 49:25
Isaiah 49:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼezie, a ga-esi nʼaka ndị bụ dike nʼagha pụnara ha ndị ha dọtara nʼagha. A ga-esitekwa nʼaka onye na-akpa ike napụta ya ihe ọ dọtara nʼagha. Nʼihi na aga m ebuso ha agha bụ ndị niile na-ebuso gị agha. Aga m anapụtakwa ụmụ gị.
Isaiah 49:25 in English
Isaiah 49:25 · Berean Standard Bible
Indeed, this is what the LORD says: “Even the captives of the mighty will be taken away, and the plunder of the tyrant will be retrieved; I will contend with those who contend with you, and I will save your children.
Context
23Ndị eze ga-abụkwa ndị nna na-azụ ụmụ gị,
ndị eze nwanyị ha ga-abụkwa ndị inyom na-enye ụmụ gị ara.
Ha ga-akpọ isiala nye gị,
rachakwaa aja dị nʼụkwụ gị abụọ.
Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,
matakwa na ihere agaghị eme ndị niile na-ele anya inyeaka m.” 24A ga-anara dike nʼagha ihe ọ lụtara nʼagha,
maọbụ zọpụta ndị a dọọrọ nʼagha site nʼaka onye afọ tara mmiri*? 25Ma otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Nʼezie, a ga-esi nʼaka ndị bụ dike nʼagha pụnara ha ndị ha dọtara nʼagha.
A ga-esitekwa nʼaka onye na-akpa ike napụta ya ihe ọ dọtara nʼagha.
Nʼihi na aga m ebuso ha agha bụ ndị niile na-ebuso gị agha.
Aga m anapụtakwa ụmụ gị. 26Aga m eme ka ndị na-akpagbu gị rie anụ ahụ onwe ha;
ha ga-aṅụ ọbara onwe ha ṅụbiga ya oke, dịka mmanya.
Mgbe ahụ, ihe niile bụ mmadụ nʼụwa ga-amata,
na mụ onwe m Onyenwe anyị, bụ Onye na-azọpụta gị,
Onye mgbapụta gị, na Onye dị ike nke Jekọb.”
49:3 Maọbụ, ịdị ukwuu
49:9 Maọbụ, ndị a dọtara nʼagha
49:12 Nʼime akwụkwọ ndị mgbe ochie, aha ị ga-ahụ bụ Sinim.
49:20 Ndị a nọ na mba ọzọ mụọ ga-alọta
49:24 Ndị onye ezi omume dọtara nʼagha, a ga-eme ka ha wezuga onwe ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.