Aịzaya 48:17
Isaiah 48:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu, na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso.
Isaiah 48:17 in English
Isaiah 48:17 · Berean Standard Bible
Thus says the LORD your Redeemer, the Holy One of Israel: “I am the LORD your God, who teaches you for your benefit, who directs you in the way you should go.
Context
15Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m ekwuola ya;
e, akpọọla m ya.
Aga m eme ka ọbịa
nʼije ya, ọ ga-agakwa nke ọma. 16“Bịakwutenụ m nso, geenụ ntị na nke a:
“Site na mkpọsa mbụ ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu;
mgbe o mere anọ m nʼebe ahụ.”
Ma ugbu a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ezitela m,
o mejupụtala m na Mmụọ ya. 17Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel,
“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu,
na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso. 18A sịkwarị na unu ṅara ntị nʼiwu m niile,
udo unu gaara na-eru dịka osimiri,
ọdịmma* unu adịkwa ka mmali nke ebili oke osimiri. 19Mkpụrụ gị gaara amụba dịka aja,
ụmụ unu gaara a dị ka mkpụrụ ọkụkụ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ,
a gaghị ehichapụkwa aha ha,
maọbụ bibie nʼihu ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.