Aịzaya 48:18
Isaiah 48:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A sịkwarị na unu ṅara ntị nʼiwu m niile, udo unu gaara na-eru dịka osimiri, ọdịmma* unu adịkwa ka mmali nke ebili oke osimiri.
Isaiah 48:18 in English
Isaiah 48:18 · Berean Standard Bible
If only you had paid attention to My commandments, your peace would have been like a river, and your righteousness like waves of the sea.
Context
16“Bịakwutenụ m nso, geenụ ntị na nke a:
“Site na mkpọsa mbụ ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu;
mgbe o mere anọ m nʼebe ahụ.”
Ma ugbu a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ezitela m,
o mejupụtala m na Mmụọ ya. 17Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel,
“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu,
na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso. 18A sịkwarị na unu ṅara ntị nʼiwu m niile,
udo unu gaara na-eru dịka osimiri,
ọdịmma* unu adịkwa ka mmali nke ebili oke osimiri. 19Mkpụrụ gị gaara amụba dịka aja,
ụmụ unu gaara a dị ka mkpụrụ ọkụkụ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ,
a gaghị ehichapụkwa aha ha,
maọbụ bibie nʼihu ha.” 20Sitenụ na Babilọn pụọ,
gbanarịnụ ndị Kaldịa!
Werenụ olu iti mkpu ọṅụ
kwusaa inwere onwe unu a.
Meenụ ka ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa nụrụ ya
sịnụ, “Onyenwe anyị agbapụtala ohu ya Jekọb.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.