Aịzaya 48:19
Isaiah 48:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mkpụrụ gị gaara amụba dịka aja, ụmụ unu gaara a dị ka mkpụrụ ọkụkụ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, a gaghị ehichapụkwa aha ha, maọbụ bibie nʼihu ha.”
Isaiah 48:19 in English
Isaiah 48:19 · Berean Standard Bible
Your descendants would have been as countless as the sand, and your offspring as numerous as its grains;* their name would never be cut off or eliminated from My presence.”
Context
17Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel,
“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu,
na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso. 18A sịkwarị na unu ṅara ntị nʼiwu m niile,
udo unu gaara na-eru dịka osimiri,
ọdịmma* unu adịkwa ka mmali nke ebili oke osimiri. 19Mkpụrụ gị gaara amụba dịka aja,
ụmụ unu gaara a dị ka mkpụrụ ọkụkụ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ,
a gaghị ehichapụkwa aha ha,
maọbụ bibie nʼihu ha.” 20Sitenụ na Babilọn pụọ,
gbanarịnụ ndị Kaldịa!
Werenụ olu iti mkpu ọṅụ
kwusaa inwere onwe unu a.
Meenụ ka ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa nụrụ ya
sịnụ, “Onyenwe anyị agbapụtala ohu ya Jekọb.” 21Mgbe O duuru ndị ya jee ije nʼọzara, ala kpọrọ nkụ, akpịrị akpọghị ha nkụ.
O mere ka mmiri si nʼoke nkume sọpụtara ha,
e, ọ kpọwara oke nkume
mee ka mmiri sọpụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.