Aịzaya 48:16
Isaiah 48:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Bịakwutenụ m nso, geenụ ntị na nke a: “Site na mkpọsa mbụ ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu; mgbe o mere anọ m nʼebe ahụ.” Ma ugbu a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ezitela m, o mejupụtala m na Mmụọ ya.
Isaiah 48:16 in English
Isaiah 48:16 · Berean Standard Bible
Come near to Me and listen to this: From the beginning I have not spoken in secret; from the time it happened, I was there.” And now the Lord GOD has sent me, accompanied by His Spirit.
Context
14“Chịkọtaanụ onwe unu, unu niile, geenụ ntị.
Onye nʼetiti arụsị ndị a gosiri ihe ndị a na-aga ime?
Onye ahụ Onyenwe anyị họọrọ ka ya na ya dị na mma
ga-emezu nzube ya megide Babilọn,
aka ya ga-emegide ndị Kaldịa. 15Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m ekwuola ya;
e, akpọọla m ya.
Aga m eme ka ọbịa
nʼije ya, ọ ga-agakwa nke ọma. 16“Bịakwutenụ m nso, geenụ ntị na nke a:
“Site na mkpọsa mbụ ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu;
mgbe o mere anọ m nʼebe ahụ.”
Ma ugbu a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ezitela m,
o mejupụtala m na Mmụọ ya. 17Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel,
“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu,
na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso. 18A sịkwarị na unu ṅara ntị nʼiwu m niile,
udo unu gaara na-eru dịka osimiri,
ọdịmma* unu adịkwa ka mmali nke ebili oke osimiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.