Aịzaya 48:14
Isaiah 48:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Chịkọtaanụ onwe unu, unu niile, geenụ ntị. Onye nʼetiti arụsị ndị a gosiri ihe ndị a na-aga ime? Onye ahụ Onyenwe anyị họọrọ ka ya na ya dị na mma ga-emezu nzube ya megide Babilọn, aka ya ga-emegide ndị Kaldịa.
Isaiah 48:14 in English
Isaiah 48:14 · Berean Standard Bible
Come together, all of you, and listen: Which of the idols has foretold these things? The LORD’s chosen ally will carry out His desire against Babylon, and His arm will be against the Chaldeans.*
Context
12“Geenụ m ntị, gị Jekọb,
na gị Izrel onye m kpọrọ.
Mụ onwe m bụ onye ahụ;
Abụ m onye mbụ, bụrụkwa onye ikpeazụ. 13Ọ bụ aka m tọrọ ntọala ụwa.
Ọ bụkwa aka nri m gbasara eluigwe.
Mgbe m kpọrọ ha oku
ha na-abịa guzo nʼihu m. 14“Chịkọtaanụ onwe unu, unu niile, geenụ ntị.
Onye nʼetiti arụsị ndị a gosiri ihe ndị a na-aga ime?
Onye ahụ Onyenwe anyị họọrọ ka ya na ya dị na mma
ga-emezu nzube ya megide Babilọn,
aka ya ga-emegide ndị Kaldịa. 15Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m ekwuola ya;
e, akpọọla m ya.
Aga m eme ka ọbịa
nʼije ya, ọ ga-agakwa nke ọma. 16“Bịakwutenụ m nso, geenụ ntị na nke a:
“Site na mkpọsa mbụ ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu;
mgbe o mere anọ m nʼebe ahụ.”
Ma ugbu a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ezitela m,
o mejupụtala m na Mmụọ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.