Native Bible

Isaiah 48:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Geenụ m ntị, gị Jekọb, na gị Izrel onye m kpọrọ. Mụ onwe m bụ onye ahụ; Abụ m onye mbụ, bụrụkwa onye ikpeazụ.

Isaiah 48:12 in English

Isaiah 48:12 · Berean Standard Bible

Listen to Me, O Jacob, and Israel, whom I have called: I am He; I am the first, and I am the last.

Context

10Lee, anụchaalam unu, ma ọ bụghị dịka e si anụcha ọlaọcha nʼọkụ. E, anwaleela m unu nʼoke ọkụ nke ahụhụ. 11Nʼihi mụ onwe m, e, nʼihi mụ onwe m, ka m na-eme nke a. Aga m esi aṅaa hapụ ka m bụrụ onye emere ka aha m ghara ịdị nsọ? Agaghị m enye onye ọzọ otuto m. 12“Geenụ m ntị, gị Jekọb, na gị Izrel onye m kpọrọ. Mụ onwe m bụ onye ahụ; Abụ m onye mbụ, bụrụkwa onye ikpeazụ. 13Ọ bụ aka m tọrọ ntọala ụwa. Ọ bụkwa aka nri m gbasara eluigwe. Mgbe m kpọrọ ha oku ha na-abịa guzo nʼihu m. 14“Chịkọtaanụ onwe unu, unu niile, geenụ ntị. Onye nʼetiti arụsị ndị a gosiri ihe ndị a na-aga ime? Onye ahụ Onyenwe anyị họọrọ ka ya na ya dị na mma ga-emezu nzube ya megide Babilọn, aka ya ga-emegide ndị Kaldịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.