Aịzaya 48:12
Isaiah 48:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Geenụ m ntị, gị Jekọb, na gị Izrel onye m kpọrọ. Mụ onwe m bụ onye ahụ; Abụ m onye mbụ, bụrụkwa onye ikpeazụ.
Isaiah 48:12 in English
Isaiah 48:12 · Berean Standard Bible
Listen to Me, O Jacob, and Israel, whom I have called: I am He; I am the first, and I am the last.
Context
10Lee, anụchaalam unu, ma ọ bụghị dịka e si anụcha ọlaọcha nʼọkụ.
E, anwaleela m unu nʼoke ọkụ nke ahụhụ. 11Nʼihi mụ onwe m, e, nʼihi mụ onwe m, ka m na-eme nke a.
Aga m esi aṅaa hapụ ka m bụrụ onye emere ka aha m ghara ịdị nsọ?
Agaghị m enye onye ọzọ otuto m. 12“Geenụ m ntị, gị Jekọb,
na gị Izrel onye m kpọrọ.
Mụ onwe m bụ onye ahụ;
Abụ m onye mbụ, bụrụkwa onye ikpeazụ. 13Ọ bụ aka m tọrọ ntọala ụwa.
Ọ bụkwa aka nri m gbasara eluigwe.
Mgbe m kpọrọ ha oku
ha na-abịa guzo nʼihu m. 14“Chịkọtaanụ onwe unu, unu niile, geenụ ntị.
Onye nʼetiti arụsị ndị a gosiri ihe ndị a na-aga ime?
Onye ahụ Onyenwe anyị họọrọ ka ya na ya dị na mma
ga-emezu nzube ya megide Babilọn,
aka ya ga-emegide ndị Kaldịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.