Aịzaya 48:13
Isaiah 48:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ aka m tọrọ ntọala ụwa. Ọ bụkwa aka nri m gbasara eluigwe. Mgbe m kpọrọ ha oku ha na-abịa guzo nʼihu m.
Isaiah 48:13 in English
Isaiah 48:13 · Berean Standard Bible
Surely My own hand founded the earth, and My right hand spread out the heavens; when I summon them, they stand up together.
Context
11Nʼihi mụ onwe m, e, nʼihi mụ onwe m, ka m na-eme nke a.
Aga m esi aṅaa hapụ ka m bụrụ onye emere ka aha m ghara ịdị nsọ?
Agaghị m enye onye ọzọ otuto m. 12“Geenụ m ntị, gị Jekọb,
na gị Izrel onye m kpọrọ.
Mụ onwe m bụ onye ahụ;
Abụ m onye mbụ, bụrụkwa onye ikpeazụ. 13Ọ bụ aka m tọrọ ntọala ụwa.
Ọ bụkwa aka nri m gbasara eluigwe.
Mgbe m kpọrọ ha oku
ha na-abịa guzo nʼihu m. 14“Chịkọtaanụ onwe unu, unu niile, geenụ ntị.
Onye nʼetiti arụsị ndị a gosiri ihe ndị a na-aga ime?
Onye ahụ Onyenwe anyị họọrọ ka ya na ya dị na mma
ga-emezu nzube ya megide Babilọn,
aka ya ga-emegide ndị Kaldịa. 15Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m ekwuola ya;
e, akpọọla m ya.
Aga m eme ka ọbịa
nʼije ya, ọ ga-agakwa nke ọma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.