Native Bible

Isaiah 48:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m ekwuola ya; e, akpọọla m ya. Aga m eme ka ọbịa nʼije ya, ọ ga-agakwa nke ọma.

Isaiah 48:15 in English

Isaiah 48:15 · Berean Standard Bible

I, even I, have spoken; yes, I have called him. I have brought him, and he will succeed in his mission.

Context

13Ọ bụ aka m tọrọ ntọala ụwa. Ọ bụkwa aka nri m gbasara eluigwe. Mgbe m kpọrọ ha oku ha na-abịa guzo nʼihu m. 14“Chịkọtaanụ onwe unu, unu niile, geenụ ntị. Onye nʼetiti arụsị ndị a gosiri ihe ndị a na-aga ime? Onye ahụ Onyenwe anyị họọrọ ka ya na ya dị na mma ga-emezu nzube ya megide Babilọn, aka ya ga-emegide ndị Kaldịa. 15Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m ekwuola ya; e, akpọọla m ya. Aga m eme ka ọbịa nʼije ya, ọ ga-agakwa nke ọma. 16“Bịakwutenụ m nso, geenụ ntị na nke a: “Site na mkpọsa mbụ ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu; mgbe o mere anọ m nʼebe ahụ.” Ma ugbu a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ezitela m, o mejupụtala m na Mmụọ ya. 17Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu, na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.