Aịzaya 48:15
Isaiah 48:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m ekwuola ya; e, akpọọla m ya. Aga m eme ka ọbịa nʼije ya, ọ ga-agakwa nke ọma.
Isaiah 48:15 in English
Isaiah 48:15 · Berean Standard Bible
I, even I, have spoken; yes, I have called him. I have brought him, and he will succeed in his mission.
Context
13Ọ bụ aka m tọrọ ntọala ụwa.
Ọ bụkwa aka nri m gbasara eluigwe.
Mgbe m kpọrọ ha oku
ha na-abịa guzo nʼihu m. 14“Chịkọtaanụ onwe unu, unu niile, geenụ ntị.
Onye nʼetiti arụsị ndị a gosiri ihe ndị a na-aga ime?
Onye ahụ Onyenwe anyị họọrọ ka ya na ya dị na mma
ga-emezu nzube ya megide Babilọn,
aka ya ga-emegide ndị Kaldịa. 15Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m ekwuola ya;
e, akpọọla m ya.
Aga m eme ka ọbịa
nʼije ya, ọ ga-agakwa nke ọma. 16“Bịakwutenụ m nso, geenụ ntị na nke a:
“Site na mkpọsa mbụ ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu;
mgbe o mere anọ m nʼebe ahụ.”
Ma ugbu a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ezitela m,
o mejupụtala m na Mmụọ ya. 17Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel,
“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu,
na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.