Aịzaya 45:5
Isaiah 45:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ m bụ Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị; ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị. Ọ bụ ezie na ị maghị m, ma aga m eme ka ị dịrị ike.
Isaiah 45:5 in English
Isaiah 45:5 · Berean Standard Bible
I am the LORD, and there is no other; there is no God but Me. I will equip you for battle, though you have not known Me,
Context
3Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara,
akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche.
Ka ị mata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,
bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile. 4Nʼihi Jekọb bụ ohu m,
nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m,
ka m ji kpọọ gị aha gị
nyekwa gị aha nke nsọpụrụ,*
maọbụ ezie na ị maghị onye m bụ. 5Ọ bụ m bụ Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị;
ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.
Ọ bụ ezie na ị maghị m,
ma aga m eme ka ị dịrị ike. 6Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ
ruo nʼọdịda anyanwụ,
ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m.
Abụ m Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị. 7Ọ bụ m kpụrụ ìhè, keekwa ọchịchịrị.
Ọ bụ m na-ezite ọganihu, na-ekekwa ịla nʼiyi.
Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, na-eme ihe ndị a niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.