Aịzaya 45:4
Isaiah 45:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi Jekọb bụ ohu m, nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m, ka m ji kpọọ gị aha gị nyekwa gị aha nke nsọpụrụ,* maọbụ ezie na ị maghị onye m bụ.
Isaiah 45:4 in English
Isaiah 45:4 · Berean Standard Bible
For the sake of Jacob My servant and Israel My chosen one, I call you by name; I have given you a title of honor, though you have not known Me.
Context
2Mụ onwe m ga-ebu ụzọ gaa nʼihu gị
kwazee ugwu ukwu niile,
tiwasịa ibo ọnụ ụzọ bronz niile
gbuwakwaa mkpọrọ igwe dị iche iche. 3Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara,
akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche.
Ka ị mata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,
bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile. 4Nʼihi Jekọb bụ ohu m,
nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m,
ka m ji kpọọ gị aha gị
nyekwa gị aha nke nsọpụrụ,*
maọbụ ezie na ị maghị onye m bụ. 5Ọ bụ m bụ Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị;
ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.
Ọ bụ ezie na ị maghị m,
ma aga m eme ka ị dịrị ike. 6Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ
ruo nʼọdịda anyanwụ,
ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m.
Abụ m Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.