Native Bible

Isaiah 45:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m. Abụ m Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị.

Isaiah 45:6 in English

Isaiah 45:6 · Berean Standard Bible

so that all may know, from where the sun rises to where it sets, that there is none but Me; I am the LORD, and there is no other.

Context

4Nʼihi Jekọb bụ ohu m, nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m, ka m ji kpọọ gị aha gị nyekwa gị aha nke nsọpụrụ,* maọbụ ezie na ị maghị onye m bụ. 5Ọ bụ m bụ Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị; ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị. Ọ bụ ezie na ị maghị m, ma aga m eme ka ị dịrị ike. 6Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m. Abụ m Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị. 7Ọ bụ m kpụrụ ìhè, keekwa ọchịchịrị. Ọ bụ m na-ezite ọganihu, na-ekekwa ịla nʼiyi. Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, na-eme ihe ndị a niile. 8“Gị, eluigwe, zodata ezi omume m ka mbara eluigwe na-ezodakwa ya dịka mmiri. Ka ala meghee onwe ya, ka nzọpụta pupụta, ka ezi omume soro ya puokwa dịka ahịhịa. Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị kere ha niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.