Aịzaya 45:6
Isaiah 45:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m. Abụ m Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị.
Isaiah 45:6 in English
Isaiah 45:6 · Berean Standard Bible
so that all may know, from where the sun rises to where it sets, that there is none but Me; I am the LORD, and there is no other.
Context
4Nʼihi Jekọb bụ ohu m,
nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m,
ka m ji kpọọ gị aha gị
nyekwa gị aha nke nsọpụrụ,*
maọbụ ezie na ị maghị onye m bụ. 5Ọ bụ m bụ Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị;
ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.
Ọ bụ ezie na ị maghị m,
ma aga m eme ka ị dịrị ike. 6Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ
ruo nʼọdịda anyanwụ,
ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m.
Abụ m Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị. 7Ọ bụ m kpụrụ ìhè, keekwa ọchịchịrị.
Ọ bụ m na-ezite ọganihu, na-ekekwa ịla nʼiyi.
Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, na-eme ihe ndị a niile. 8“Gị, eluigwe, zodata ezi omume m
ka mbara eluigwe na-ezodakwa ya dịka mmiri.
Ka ala meghee onwe ya,
ka nzọpụta pupụta,
ka ezi omume soro ya puokwa dịka ahịhịa.
Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị kere ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.