Aịzaya 45:8
Isaiah 45:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gị, eluigwe, zodata ezi omume m ka mbara eluigwe na-ezodakwa ya dịka mmiri. Ka ala meghee onwe ya, ka nzọpụta pupụta, ka ezi omume soro ya puokwa dịka ahịhịa. Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị kere ha niile.
Isaiah 45:8 in English
Isaiah 45:8 · Berean Standard Bible
Drip down, O heavens, from above, and let the skies pour down righteousness. Let the earth open up that salvation may sprout and righteousness spring up with it; I, the LORD, have created it.
Context
6Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ
ruo nʼọdịda anyanwụ,
ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m.
Abụ m Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị. 7Ọ bụ m kpụrụ ìhè, keekwa ọchịchịrị.
Ọ bụ m na-ezite ọganihu, na-ekekwa ịla nʼiyi.
Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, na-eme ihe ndị a niile. 8“Gị, eluigwe, zodata ezi omume m
ka mbara eluigwe na-ezodakwa ya dịka mmiri.
Ka ala meghee onwe ya,
ka nzọpụta pupụta,
ka ezi omume soro ya puokwa dịka ahịhịa.
Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị kere ha niile. 9“Ahụhụ na-adịrị mmadụ ahụ nke na-alụso onye kere ya ọgụ,
mmadụ ahụ bụ otu mpekele ejuju
nʼetiti mpekele ejuju niile dị nʼala.
Ụrọ ọ na-ajụ onye ji ya akpụ ihe ajụjụ sị,
‘Gịnị ka i ji m akpụ?’
Ka ọrụ gị ọ ga-asị,
‘Lee, ọ dịghị aka abụọ o nwere’? 10Ahụhụ na-adịrị nwantakịrị ahụ gwara nna ya okwu sị,
‘Gịnị ka ị mụtara na nwa?’
maọbụ sịkwa nne ya,
‘Gịnị bụ ihe ị mụpụtara?’*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.