Aịzaya 45:9
Isaiah 45:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ahụhụ na-adịrị mmadụ ahụ nke na-alụso onye kere ya ọgụ, mmadụ ahụ bụ otu mpekele ejuju nʼetiti mpekele ejuju niile dị nʼala. Ụrọ ọ na-ajụ onye ji ya akpụ ihe ajụjụ sị, ‘Gịnị ka i ji m akpụ?’ Ka ọrụ gị ọ ga-asị, ‘Lee, ọ dịghị aka abụọ o nwere’?
Isaiah 45:9 in English
Isaiah 45:9 · Berean Standard Bible
Woe to him who quarrels with his Maker— one clay pot among many. Does the clay ask the potter, ‘What are you making?’* Does your work say, ‘He has no hands’?
Context
7Ọ bụ m kpụrụ ìhè, keekwa ọchịchịrị.
Ọ bụ m na-ezite ọganihu, na-ekekwa ịla nʼiyi.
Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, na-eme ihe ndị a niile. 8“Gị, eluigwe, zodata ezi omume m
ka mbara eluigwe na-ezodakwa ya dịka mmiri.
Ka ala meghee onwe ya,
ka nzọpụta pupụta,
ka ezi omume soro ya puokwa dịka ahịhịa.
Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị kere ha niile. 9“Ahụhụ na-adịrị mmadụ ahụ nke na-alụso onye kere ya ọgụ,
mmadụ ahụ bụ otu mpekele ejuju
nʼetiti mpekele ejuju niile dị nʼala.
Ụrọ ọ na-ajụ onye ji ya akpụ ihe ajụjụ sị,
‘Gịnị ka i ji m akpụ?’
Ka ọrụ gị ọ ga-asị,
‘Lee, ọ dịghị aka abụọ o nwere’? 10Ahụhụ na-adịrị nwantakịrị ahụ gwara nna ya okwu sị,
‘Gịnị ka ị mụtara na nwa?’
maọbụ sịkwa nne ya,
‘Gịnị bụ ihe ị mụpụtara?’* 11“Otu a ka Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel,
Onye kere Izrel na-ajụ ajụjụ sị;
banyere ihe ndị gaje ime
ị na-ajụ m ajụjụ banyere ụmụ m,
maọbụ nye m iwu banyere ọrụ aka m?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.