Aịzaya 45:11
Isaiah 45:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Otu a ka Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel, Onye kere Izrel na-ajụ ajụjụ sị; banyere ihe ndị gaje ime ị na-ajụ m ajụjụ banyere ụmụ m, maọbụ nye m iwu banyere ọrụ aka m?
Isaiah 45:11 in English
Isaiah 45:11 · Berean Standard Bible
Thus says the LORD, the Holy One of Israel, and its Maker: “How dare you question Me about My sons, or instruct Me in the work of My hands?
Context
9“Ahụhụ na-adịrị mmadụ ahụ nke na-alụso onye kere ya ọgụ,
mmadụ ahụ bụ otu mpekele ejuju
nʼetiti mpekele ejuju niile dị nʼala.
Ụrọ ọ na-ajụ onye ji ya akpụ ihe ajụjụ sị,
‘Gịnị ka i ji m akpụ?’
Ka ọrụ gị ọ ga-asị,
‘Lee, ọ dịghị aka abụọ o nwere’? 10Ahụhụ na-adịrị nwantakịrị ahụ gwara nna ya okwu sị,
‘Gịnị ka ị mụtara na nwa?’
maọbụ sịkwa nne ya,
‘Gịnị bụ ihe ị mụpụtara?’* 11“Otu a ka Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel,
Onye kere Izrel na-ajụ ajụjụ sị;
banyere ihe ndị gaje ime
ị na-ajụ m ajụjụ banyere ụmụ m,
maọbụ nye m iwu banyere ọrụ aka m? 12Ọ bụ mụ onwe m kere ụwa,
keekwa mmadụ ka o biri nʼime ya.
Aka m abụọ ka m ji gbasaa mbara igwe,
nyekwa kpakpando niile iwu. 13M ga-akpọlite Sairọs nʼezi omume m:
M ga-eme ka ụzọ ya niile zie ezi.
Ọ ga-ewughachi obodo m,
mee ka ndị m a dọtara nʼagha nwere onwe ha,
ma ọ bụghị nʼihi ọnụahịa maọbụ ihe nrite,
ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.