Aịzaya 45:13
Isaiah 45:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
M ga-akpọlite Sairọs nʼezi omume m: M ga-eme ka ụzọ ya niile zie ezi. Ọ ga-ewughachi obodo m, mee ka ndị m a dọtara nʼagha nwere onwe ha, ma ọ bụghị nʼihi ọnụahịa maọbụ ihe nrite, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.”
Isaiah 45:13 in English
Isaiah 45:13 · Berean Standard Bible
I will raise up Cyrus in righteousness, and I will make all his ways straight. He will rebuild My city and set My exiles free, but not for payment or reward, says the LORD of Hosts.”
Context
11“Otu a ka Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel,
Onye kere Izrel na-ajụ ajụjụ sị;
banyere ihe ndị gaje ime
ị na-ajụ m ajụjụ banyere ụmụ m,
maọbụ nye m iwu banyere ọrụ aka m? 12Ọ bụ mụ onwe m kere ụwa,
keekwa mmadụ ka o biri nʼime ya.
Aka m abụọ ka m ji gbasaa mbara igwe,
nyekwa kpakpando niile iwu. 13M ga-akpọlite Sairọs nʼezi omume m:
M ga-eme ka ụzọ ya niile zie ezi.
Ọ ga-ewughachi obodo m,
mee ka ndị m a dọtara nʼagha nwere onwe ha,
ma ọ bụghị nʼihi ọnụahịa maọbụ ihe nrite,
ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.” 14Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Ihe ndị Ijipt rụpụtara na ngwa ahịa ndị Kush
na ndị Saba ahụ toro ogologo,
ha ga-abịakwute gị,
ha ga-abụ nke gị;
ha ga-esokwa gị nʼazụ
dịka ndị mkpọrọ e kere agbụ.
Ha ga-akpọ isiala nʼihu gị
rịọ gị arịrịọ, na-asị,
‘Nʼezie, ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye nọnyere gị,
ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.’ ” 15Nʼezie, gị onwe gị bụ Chineke, Onye nzọpụta Izrel.
Ị bụkwa Chineke, onye na-ezonarị mmadụ onwe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.