Aịzaya 45:15
Isaiah 45:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie, gị onwe gị bụ Chineke, Onye nzọpụta Izrel. Ị bụkwa Chineke, onye na-ezonarị mmadụ onwe ya.
Isaiah 45:15 in English
Isaiah 45:15 · Berean Standard Bible
Truly You are a God who hides Himself, O God of Israel, the Savior.
Context
13M ga-akpọlite Sairọs nʼezi omume m:
M ga-eme ka ụzọ ya niile zie ezi.
Ọ ga-ewughachi obodo m,
mee ka ndị m a dọtara nʼagha nwere onwe ha,
ma ọ bụghị nʼihi ọnụahịa maọbụ ihe nrite,
ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.” 14Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Ihe ndị Ijipt rụpụtara na ngwa ahịa ndị Kush
na ndị Saba ahụ toro ogologo,
ha ga-abịakwute gị,
ha ga-abụ nke gị;
ha ga-esokwa gị nʼazụ
dịka ndị mkpọrọ e kere agbụ.
Ha ga-akpọ isiala nʼihu gị
rịọ gị arịrịọ, na-asị,
‘Nʼezie, ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye nọnyere gị,
ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.’ ” 15Nʼezie, gị onwe gị bụ Chineke, Onye nzọpụta Izrel.
Ị bụkwa Chineke, onye na-ezonarị mmadụ onwe ya. 16A ga-eme ndị niile na-akpụ arụsị ihe ihere,
e, ihere ga-eme ha nʼihi na a ga-etinye ha nʼọnọdụ oke ihere. 17Ma Onyenwe anyị ga-eji nzọpụta
nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi zọpụta Izrel.
Ihere agaghị eme ha.
A gaghị etinyekwa ha nʼọnọdụ ihe ihere ruo mgbe ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.