Aịzaya 45:16
Isaiah 45:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-eme ndị niile na-akpụ arụsị ihe ihere, e, ihere ga-eme ha nʼihi na a ga-etinye ha nʼọnọdụ oke ihere.
Isaiah 45:16 in English
Isaiah 45:16 · Berean Standard Bible
They will all be put to shame and humiliated; the makers of idols will depart together in disgrace.
Context
14Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Ihe ndị Ijipt rụpụtara na ngwa ahịa ndị Kush
na ndị Saba ahụ toro ogologo,
ha ga-abịakwute gị,
ha ga-abụ nke gị;
ha ga-esokwa gị nʼazụ
dịka ndị mkpọrọ e kere agbụ.
Ha ga-akpọ isiala nʼihu gị
rịọ gị arịrịọ, na-asị,
‘Nʼezie, ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye nọnyere gị,
ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.’ ” 15Nʼezie, gị onwe gị bụ Chineke, Onye nzọpụta Izrel.
Ị bụkwa Chineke, onye na-ezonarị mmadụ onwe ya. 16A ga-eme ndị niile na-akpụ arụsị ihe ihere,
e, ihere ga-eme ha nʼihi na a ga-etinye ha nʼọnọdụ oke ihere. 17Ma Onyenwe anyị ga-eji nzọpụta
nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi zọpụta Izrel.
Ihere agaghị eme ha.
A gaghị etinyekwa ha nʼọnọdụ ihe ihere ruo mgbe ebighị ebi. 18Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe sịrị,
ọ bụ ya dobekwara ihe niile nʼọnọdụ ha.
Ọ bụ ya, bụ Chineke,
onye zubere ma kee ụwa,
tọkwaa ntọala ya.
O keghị ụwa ka ọ tọgbọrọ nʼefu,
kama ọ bụ ka e biri nʼime ya ka o ji kee ya.
Ọ sịrị,
“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị;
ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.