Aịzaya 45:18
Isaiah 45:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe sịrị, ọ bụ ya dobekwara ihe niile nʼọnọdụ ha. Ọ bụ ya, bụ Chineke, onye zubere ma kee ụwa, tọkwaa ntọala ya. O keghị ụwa ka ọ tọgbọrọ nʼefu, kama ọ bụ ka e biri nʼime ya ka o ji kee ya. Ọ sịrị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị; ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.
Isaiah 45:18 in English
Isaiah 45:18 · Berean Standard Bible
For thus says the LORD, who created the heavens—He is God; He formed the earth and fashioned it; He established it; He did not create it to be empty, but formed it to be inhabited: “I am the LORD, and there is no other.
Context
16A ga-eme ndị niile na-akpụ arụsị ihe ihere,
e, ihere ga-eme ha nʼihi na a ga-etinye ha nʼọnọdụ oke ihere. 17Ma Onyenwe anyị ga-eji nzọpụta
nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi zọpụta Izrel.
Ihere agaghị eme ha.
A gaghị etinyekwa ha nʼọnọdụ ihe ihere ruo mgbe ebighị ebi. 18Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe sịrị,
ọ bụ ya dobekwara ihe niile nʼọnọdụ ha.
Ọ bụ ya, bụ Chineke,
onye zubere ma kee ụwa,
tọkwaa ntọala ya.
O keghị ụwa ka ọ tọgbọrọ nʼefu,
kama ọ bụ ka e biri nʼime ya ka o ji kee ya.
Ọ sịrị,
“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị;
ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị. 19Ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu,
site nʼotu ebe nʼala nke ọchịchịrị.
Agwaghị m mkpụrụ Jekọb
‘Chọọnụ m nʼefu.’
Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị na-ekwu eziokwu,
Ana m ekwupụta ihe ziri ezi. 20“Chịkọtaanụ onwe unu, gbakọtanụ,
bịanụ nso, unu ndị si na mba niile gbapụta ọsọ ndụ.
Ha amaghị ihe bụ ndị a na-ebugharị chi osisi e ji aka mee,
ndị na-ekpekwara chi ndị ahụ na-enweghị ike ịzọpụta ekpere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.