Native Bible

Isaiah 45:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Chịkọtaanụ onwe unu, gbakọtanụ, bịanụ nso, unu ndị si na mba niile gbapụta ọsọ ndụ. Ha amaghị ihe bụ ndị a na-ebugharị chi osisi e ji aka mee, ndị na-ekpekwara chi ndị ahụ na-enweghị ike ịzọpụta ekpere.

Isaiah 45:20 in English

Isaiah 45:20 · Berean Standard Bible

Come, gather together, and draw near, you fugitives from the nations. Ignorant are those who carry idols of wood and pray to a god that cannot save.

Context

18Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe sịrị, ọ bụ ya dobekwara ihe niile nʼọnọdụ ha. Ọ bụ ya, bụ Chineke, onye zubere ma kee ụwa, tọkwaa ntọala ya. O keghị ụwa ka ọ tọgbọrọ nʼefu, kama ọ bụ ka e biri nʼime ya ka o ji kee ya. Ọ sịrị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị; ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị. 19Ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu, site nʼotu ebe nʼala nke ọchịchịrị. Agwaghị m mkpụrụ Jekọb ‘Chọọnụ m nʼefu.’ Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị na-ekwu eziokwu, Ana m ekwupụta ihe ziri ezi. 20“Chịkọtaanụ onwe unu, gbakọtanụ, bịanụ nso, unu ndị si na mba niile gbapụta ọsọ ndụ. Ha amaghị ihe bụ ndị a na-ebugharị chi osisi e ji aka mee, ndị na-ekpekwara chi ndị ahụ na-enweghị ike ịzọpụta ekpere. 21Kwupụtanụ ihe kwesiri ịdị, gosinụ ya, ka ha gbaakọkwa izu. Onye buru ụzọ kwuo ihe ndị a nʼoge gara aga, onye kwupụtara ya site na mgbe ochie? Ọ bụghị mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị? Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị mụ onwe m, Chineke onye ezi omume na Onye nzọpụta; ọ dịghị onye ọzọ dị ma ewezuga m. 22“Laghachikwutenụ m, ka m zọpụta unu. Laghachikwutenụ m, unu ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa. Nʼihi na ọ bụ naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.