Aịzaya 45:22
Isaiah 45:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Laghachikwutenụ m, ka m zọpụta unu. Laghachikwutenụ m, unu ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa. Nʼihi na ọ bụ naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.
Isaiah 45:22 in English
Isaiah 45:22 · Berean Standard Bible
Turn to Me and be saved, all the ends of the earth; for I am God, and there is no other.
Context
20“Chịkọtaanụ onwe unu, gbakọtanụ,
bịanụ nso, unu ndị si na mba niile gbapụta ọsọ ndụ.
Ha amaghị ihe bụ ndị a na-ebugharị chi osisi e ji aka mee,
ndị na-ekpekwara chi ndị ahụ na-enweghị ike ịzọpụta ekpere. 21Kwupụtanụ ihe kwesiri ịdị, gosinụ ya,
ka ha gbaakọkwa izu.
Onye buru ụzọ kwuo ihe ndị a nʼoge gara aga,
onye kwupụtara ya site na mgbe ochie?
Ọ bụghị mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị?
Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị mụ onwe m,
Chineke onye ezi omume na Onye nzọpụta;
ọ dịghị onye ọzọ dị ma ewezuga m. 22“Laghachikwutenụ m, ka m zọpụta unu.
Laghachikwutenụ m, unu ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa.
Nʼihi na ọ bụ naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị. 23Ejirila m onwe m ṅụọ iyi,
ọnụ m ekwupụla okwu nʼezi omume,
bụ okwu nke na-enweghị mgbanwe:
Nʼihu m ka ikpere niile ọbụla ga-egbu nʼala;
mụ ka ire niile ọbụla ga-aṅụrụ iyi. 24E, ha ga-ekwupụta sị, ‘Ọ bụ nʼime Onyenwe anyị naanị
ka ezi omume na ike dị.’ ”
Ndị niile na-akpọ ya asị ga-abịakwute ya.
Ihere ga-emekwa ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.