Aịzaya 45:23
Isaiah 45:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ejirila m onwe m ṅụọ iyi, ọnụ m ekwupụla okwu nʼezi omume, bụ okwu nke na-enweghị mgbanwe: Nʼihu m ka ikpere niile ọbụla ga-egbu nʼala; mụ ka ire niile ọbụla ga-aṅụrụ iyi.
Isaiah 45:23 in English
Isaiah 45:23 · Berean Standard Bible
By Myself I have sworn; truth has gone out from My mouth, a word that will not be revoked: Every knee will bow before Me, every tongue will swear allegiance.*
Context
21Kwupụtanụ ihe kwesiri ịdị, gosinụ ya,
ka ha gbaakọkwa izu.
Onye buru ụzọ kwuo ihe ndị a nʼoge gara aga,
onye kwupụtara ya site na mgbe ochie?
Ọ bụghị mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị?
Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị mụ onwe m,
Chineke onye ezi omume na Onye nzọpụta;
ọ dịghị onye ọzọ dị ma ewezuga m. 22“Laghachikwutenụ m, ka m zọpụta unu.
Laghachikwutenụ m, unu ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa.
Nʼihi na ọ bụ naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị. 23Ejirila m onwe m ṅụọ iyi,
ọnụ m ekwupụla okwu nʼezi omume,
bụ okwu nke na-enweghị mgbanwe:
Nʼihu m ka ikpere niile ọbụla ga-egbu nʼala;
mụ ka ire niile ọbụla ga-aṅụrụ iyi. 24E, ha ga-ekwupụta sị, ‘Ọ bụ nʼime Onyenwe anyị naanị
ka ezi omume na ike dị.’ ”
Ndị niile na-akpọ ya asị ga-abịakwute ya.
Ihere ga-emekwa ha. 25Ma agbụrụ niile nke Izrel
ga-achọta nnapụta ha nʼime Onyenwe anyị,*
ọ bụkwa na ya ka ha ga-anya isi.
45:4 Tuo gị aha nsọpụrụ
45:10 Ime gịnị na-eme gị
45:25 NʼOnyenwe anyị ka a ga-agụ agbụrụ niile nke Izrel ka ndị ezi omume.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.