Native Bible

Isaiah 45:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E, ha ga-ekwupụta sị, ‘Ọ bụ nʼime Onyenwe anyị naanị ka ezi omume na ike dị.’ ” Ndị niile na-akpọ ya asị ga-abịakwute ya. Ihere ga-emekwa ha.

Isaiah 45:24 in English

Isaiah 45:24 · Berean Standard Bible

Surely they will say of Me, ‘In the LORD alone are righteousness and strength.’” All who rage against Him will come to Him and be put to shame.

Context

22“Laghachikwutenụ m, ka m zọpụta unu. Laghachikwutenụ m, unu ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa. Nʼihi na ọ bụ naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị. 23Ejirila m onwe m ṅụọ iyi, ọnụ m ekwupụla okwu nʼezi omume, bụ okwu nke na-enweghị mgbanwe: Nʼihu m ka ikpere niile ọbụla ga-egbu nʼala; mụ ka ire niile ọbụla ga-aṅụrụ iyi. 24E, ha ga-ekwupụta sị, ‘Ọ bụ nʼime Onyenwe anyị naanị ka ezi omume na ike dị.’ ” Ndị niile na-akpọ ya asị ga-abịakwute ya. Ihere ga-emekwa ha. 25Ma agbụrụ niile nke Izrel ga-achọta nnapụta ha nʼime Onyenwe anyị,* ọ bụkwa na ya ka ha ga-anya isi. 45:4 Tuo gị aha nsọpụrụ 45:10 Ime gịnị na-eme gị 45:25 NʼOnyenwe anyị ka a ga-agụ agbụrụ niile nke Izrel ka ndị ezi omume.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.