Native Bible

Isaiah 45:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Ihe ndị Ijipt rụpụtara na ngwa ahịa ndị Kush na ndị Saba ahụ toro ogologo, ha ga-abịakwute gị, ha ga-abụ nke gị; ha ga-esokwa gị nʼazụ dịka ndị mkpọrọ e kere agbụ. Ha ga-akpọ isiala nʼihu gị rịọ gị arịrịọ, na-asị, ‘Nʼezie, ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye nọnyere gị, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.’ ”

Isaiah 45:14 in English

Isaiah 45:14 · Berean Standard Bible

This is what the LORD says: “The products of Egypt and the merchandise of Cush,* along with the Sabeans, men of stature, will come over to you and will be yours; they will trudge behind you; they will come over in chains and bow down to you. They will confess to you: ‘God is indeed with you, and there is no other; there is no other God.’”

Context

12Ọ bụ mụ onwe m kere ụwa, keekwa mmadụ ka o biri nʼime ya. Aka m abụọ ka m ji gbasaa mbara igwe, nyekwa kpakpando niile iwu. 13M ga-akpọlite Sairọs nʼezi omume m: M ga-eme ka ụzọ ya niile zie ezi. Ọ ga-ewughachi obodo m, mee ka ndị m a dọtara nʼagha nwere onwe ha, ma ọ bụghị nʼihi ọnụahịa maọbụ ihe nrite, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.” 14Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Ihe ndị Ijipt rụpụtara na ngwa ahịa ndị Kush na ndị Saba ahụ toro ogologo, ha ga-abịakwute gị, ha ga-abụ nke gị; ha ga-esokwa gị nʼazụ dịka ndị mkpọrọ e kere agbụ. Ha ga-akpọ isiala nʼihu gị rịọ gị arịrịọ, na-asị, ‘Nʼezie, ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye nọnyere gị, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.’ ” 15Nʼezie, gị onwe gị bụ Chineke, Onye nzọpụta Izrel. Ị bụkwa Chineke, onye na-ezonarị mmadụ onwe ya. 16A ga-eme ndị niile na-akpụ arụsị ihe ihere, e, ihere ga-eme ha nʼihi na a ga-etinye ha nʼọnọdụ oke ihere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.