Aịzaya 45:12
Isaiah 45:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ mụ onwe m kere ụwa, keekwa mmadụ ka o biri nʼime ya. Aka m abụọ ka m ji gbasaa mbara igwe, nyekwa kpakpando niile iwu.
Isaiah 45:12 in English
Isaiah 45:12 · Berean Standard Bible
It is I who made the earth and created man upon it. It was My hands that stretched out the heavens, and I ordained all their host.
Context
10Ahụhụ na-adịrị nwantakịrị ahụ gwara nna ya okwu sị,
‘Gịnị ka ị mụtara na nwa?’
maọbụ sịkwa nne ya,
‘Gịnị bụ ihe ị mụpụtara?’* 11“Otu a ka Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel,
Onye kere Izrel na-ajụ ajụjụ sị;
banyere ihe ndị gaje ime
ị na-ajụ m ajụjụ banyere ụmụ m,
maọbụ nye m iwu banyere ọrụ aka m? 12Ọ bụ mụ onwe m kere ụwa,
keekwa mmadụ ka o biri nʼime ya.
Aka m abụọ ka m ji gbasaa mbara igwe,
nyekwa kpakpando niile iwu. 13M ga-akpọlite Sairọs nʼezi omume m:
M ga-eme ka ụzọ ya niile zie ezi.
Ọ ga-ewughachi obodo m,
mee ka ndị m a dọtara nʼagha nwere onwe ha,
ma ọ bụghị nʼihi ọnụahịa maọbụ ihe nrite,
ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.” 14Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Ihe ndị Ijipt rụpụtara na ngwa ahịa ndị Kush
na ndị Saba ahụ toro ogologo,
ha ga-abịakwute gị,
ha ga-abụ nke gị;
ha ga-esokwa gị nʼazụ
dịka ndị mkpọrọ e kere agbụ.
Ha ga-akpọ isiala nʼihu gị
rịọ gị arịrịọ, na-asị,
‘Nʼezie, ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye nọnyere gị,
ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.