Aịzaya 45:7
Isaiah 45:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ m kpụrụ ìhè, keekwa ọchịchịrị. Ọ bụ m na-ezite ọganihu, na-ekekwa ịla nʼiyi. Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, na-eme ihe ndị a niile.
Isaiah 45:7 in English
Isaiah 45:7 · Berean Standard Bible
I form the light and create the darkness; I bring prosperity and create calamity. I, the LORD, do all these things.
Context
5Ọ bụ m bụ Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị;
ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.
Ọ bụ ezie na ị maghị m,
ma aga m eme ka ị dịrị ike. 6Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ
ruo nʼọdịda anyanwụ,
ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m.
Abụ m Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị. 7Ọ bụ m kpụrụ ìhè, keekwa ọchịchịrị.
Ọ bụ m na-ezite ọganihu, na-ekekwa ịla nʼiyi.
Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, na-eme ihe ndị a niile. 8“Gị, eluigwe, zodata ezi omume m
ka mbara eluigwe na-ezodakwa ya dịka mmiri.
Ka ala meghee onwe ya,
ka nzọpụta pupụta,
ka ezi omume soro ya puokwa dịka ahịhịa.
Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị kere ha niile. 9“Ahụhụ na-adịrị mmadụ ahụ nke na-alụso onye kere ya ọgụ,
mmadụ ahụ bụ otu mpekele ejuju
nʼetiti mpekele ejuju niile dị nʼala.
Ụrọ ọ na-ajụ onye ji ya akpụ ihe ajụjụ sị,
‘Gịnị ka i ji m akpụ?’
Ka ọrụ gị ọ ga-asị,
‘Lee, ọ dịghị aka abụọ o nwere’?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.