Native Bible

Isaiah 45:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mụ onwe m ga-ebu ụzọ gaa nʼihu gị kwazee ugwu ukwu niile, tiwasịa ibo ọnụ ụzọ bronz niile gbuwakwaa mkpọrọ igwe dị iche iche.

Isaiah 45:2 in English

Isaiah 45:2 · Berean Standard Bible

“I will go before you and level the mountains;* I will break down the gates of bronze and cut through the bars of iron.

Context

1“Nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu nye ohu ya nke o tere mmanụ, bụ Sairọs, onye m ga-eji aka nri ya megide mba niile, mee ka ha nọrọ nʼokpuru ya, napụkwa ndị eze ngwa agha ha niile, megheere ya ọnụ ụzọ niile nke na ọ dịkwaghị ọnụ ụzọ ama a ga-emechibido ya. 2Mụ onwe m ga-ebu ụzọ gaa nʼihu gị kwazee ugwu ukwu niile, tiwasịa ibo ọnụ ụzọ bronz niile gbuwakwaa mkpọrọ igwe dị iche iche. 3Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara, akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche. Ka ị mata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile. 4Nʼihi Jekọb bụ ohu m, nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m, ka m ji kpọọ gị aha gị nyekwa gị aha nke nsọpụrụ,* maọbụ ezie na ị maghị onye m bụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.