Aịzaya 45:2
Isaiah 45:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mụ onwe m ga-ebu ụzọ gaa nʼihu gị kwazee ugwu ukwu niile, tiwasịa ibo ọnụ ụzọ bronz niile gbuwakwaa mkpọrọ igwe dị iche iche.
Isaiah 45:2 in English
Isaiah 45:2 · Berean Standard Bible
“I will go before you and level the mountains;* I will break down the gates of bronze and cut through the bars of iron.
Context
1“Nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu nye ohu ya nke o tere mmanụ,
bụ Sairọs, onye m ga-eji aka nri ya
megide mba niile, mee ka ha nọrọ nʼokpuru ya,
napụkwa ndị eze ngwa agha ha niile,
megheere ya ọnụ ụzọ niile
nke na ọ dịkwaghị ọnụ ụzọ ama a ga-emechibido ya. 2Mụ onwe m ga-ebu ụzọ gaa nʼihu gị
kwazee ugwu ukwu niile,
tiwasịa ibo ọnụ ụzọ bronz niile
gbuwakwaa mkpọrọ igwe dị iche iche. 3Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara,
akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche.
Ka ị mata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,
bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile. 4Nʼihi Jekọb bụ ohu m,
nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m,
ka m ji kpọọ gị aha gị
nyekwa gị aha nke nsọpụrụ,*
maọbụ ezie na ị maghị onye m bụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.